USORONKUZI ASỤSỤ IGBO N’ULỌAKWUKWỌ PRAỊMARỊNA SEKONDỊRỊ NAỊJỊRỊA: IHE A GA-EME WEE MEJUPUTAYA-NA KLAASI

Authors

DOI:

https://doi.org/10.5281/zenodo.8284955

Keywords:

Asụsụ Igbo, Praimarị, Sekọndirị, Usoronkuzi, UsoronkuziUsoro nkuzi

Abstract

Edemede a lebara anya n’usoronkuzi (curriculum) asụsụ Igbo n’ụlọụakwụkwọ primarị na

sekọndịrị nke Naijirịa. Ọ Kọwara ka usoronkuzi asụsụ Igbo, Hausa na Yoruba siri malite

n’ụlọakwụkwọ primarị na sekọndịrị Naijirịa bụ nke bụ otu n’ime mpụtara nzụkọ nke e mere

n’afọ 1969 a kpọrọ “National Curriculum Conference” n’asụsụ bekee. Odee edemede a gara

n’ihu depụta ma kọwakwaa usoro nkuzi (teaching methods) dị iche iche bụ nke ndi-nkuzi nankuziasụsụ Igbo ga-agbaso ka nkuzi ha wee gaa were ware ụfọdụ n’ime ha bụ ndịa: usoro ke

ekere, usoro ke egwuregwu, usoro ke nkọrịkọ dzg. O deputa kwara ọtụtụ ọmụmụ asụsụ Igbo naenwen’ụlọakwụkwọ ndịa nke ụfodụ n’ime ha bụ, enweghị ọtụtụ nsogbu ndi nkuzi, omume ndịnne no nna, akparamagwa ụmụakwụkwọ na onwe ha, omume ndi gọọmenti na nke ndị

ọkammụta n’ala Igbo. Ọ gakwara n’ihu wee deputa mgbochi nsogbu ndịa. Na mmechi,

edemede a na-akọwa na ọ bụrụ na ndinkuzi na-akuzi Igbo etinnye uchu n’usoro nkuzi ndị e

deputara ma kọwaa na-edemede a, ya na ọ bụrụ na nsogbu ndi edeputara ebe a abia na mgbochi,usoronkuzi (curriculum) asụsụ Igbo ga-abịa na mmezu na praimarị na sekọndirị Naijirịa.

Downloads

Published

2023-08-26

How to Cite

Dom-Anyanwu , N. (2023). USORONKUZI ASỤSỤ IGBO N’ULỌAKWUKWỌ PRAỊMARỊNA SEKONDỊRỊ NAỊJỊRỊA: IHE A GA-EME WEE MEJUPUTAYA-NA KLAASI . Journal of College of Languages and Communication Arts Education, 1(1), 262–272. https://doi.org/10.5281/zenodo.8284955