NKỤZI NA ỌMỤMỤ ASỤSỤ IGBO N’ỤLỌAKWỤKWỌ SEKỌNDỊRỊ: IHE ONYENKUZI GA-EBU N’UCHE
DOI:
https://doi.org/10.5281/zenodo.8306858Keywords:
Asụsụ, Mbunuche, Ndinkuzi, Omenala, ỌmụmụAbstract
ỤMỊEDEMEDE:
Ederede a gbadoroụkwụ na nkuzi na ọmụmụ asụsụ Igbo n’ụlọakwụkwọ Sekọndịrị. Mbunuche ederede a bụ ka nkuzi na ọmụmụ asụsụ Igbo wee tọọ atọọ n’ụlọakwụkwọ Sekọndịrị ma bụrụkwa ihe e ji amaatụ, ka ndịkuzi asụsụ Igbo mara kpọmkwem ihe ndị ha kesiri ime na klaasị ka nkuzi na mmuta wee dị ụtọ ma na-aga werewere. Ederede a gbadoroụkwụ ebe ndinkuzi nọ na sekọndiri nọ. Ụfọdụ ihe ndịnkuzi na-akuzi asụsụ Igbo ga-ebu n’uche tupu ha akuzi wee nkuzi ha bụ ndịa Mbunuche nkuzi, Ngwa nkuzi, Mkpalitemmụọ ndị ozoga. E depụtawkwara akparamagwa puruiche onyenkuzi tosiri ikpa na klaasi. Ederede a nyere ntuziaka ka ndịkuzi na-akuzi asụsụ na omenala Igbo gbasi mbo ike ihu na ha matara ihe ndị ha ga-eme ka nkuzina ọmụmụ asụsụ Igbo n’ụlọakwụkwọ Sekọndịrị tọọ atọọ, dị mfe ma na-agaka werewere. Ka asụsụ na omenala Igbo wee buru ihe a maara amara na mba niile dị n’ụwa.

Downloads
Published
How to Cite
Issue
Section
License
Copyright (c) 2023 Journal of College of Languages and Communication Arts Education

This work is licensed under a Creative Commons Attribution 4.0 International License.